8. Me ka ndi kpuru ìsì nwere anya abua puta, ha na ndi nti chiri ma ha nwere nti.
9. Achikọtawo mba nile n'otù, kpọkọta kwa ndi nile di iche iche: ònye n'etiti ha gēgosi nka, me ka ayi nuru ihe mbu nile? Ka ha weputa ndi-àmà-ha, ka ewe gua ha na ndi ezi omume: ma-ọbu ka ha nuru, si, Ezi-okwu.
10. Unu onwe-unu bu ndi-àmàm, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, na orùm nke M'rọputara: ka unu we mara, kwerem, ghọta na Mu onwem bu Onye ahu: ọ dighi chi ọzọ eburu Mu onwem uzọ kpu, ma ọ bu nke gēsom n'azu.
11. Mu onwem, ọbuná Mu onwem, bu Jehova; ọ dighi kwa onye-nzọputa di ma-ọbughi náním.
12. Mu onwem egosiwo, zọputa kwa, me kwa ka anuru, ọ dighi kwa chi ala ọzọ di n'etiti unu: unu onwe-unu bu kwa ndi-àmàm, Ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, Mu onwem bu kwa Chineke.
13. Ọzọ, site n'ubọchi ta Mu onwem bu Ya; ọ dighi kwa onye nānaputa n'akam: anamalu ọlu, ònye gēme kwa ka ọ laghachi azu?
14. Otú a ka Jehova siri, bú onye-nb͕aputa-unu na Onye Nsọ nke Israel: n'ihi unu ka M'ga-eziga ozi na Babilon, M'gēme kwa ka ha rida dika ndi-ọ̀só, ha nile, ọbuná ndi Kaldea, n'ugbọ nile nke iti-nkpu-ọṅù-ha.
15. Mu onwem bu Jehova, Onye Nsọ unu, na Onye kèworo Israel, na Eze-unu.
16. Otú a ka Jehova siri, bú Onye ahu Nke nākwa uzọ n'oké osimiri na okporo-uzọ nime miri di ike;
17. Nke nēme ka ub͕ọ-ala na inyinya na usu-ndi-agha na dìnkpà puta; n'otù ka ha nēdinakọta, ha agaghi-ebili; ha anyu a, dika ogho-oriọna ka emenyuworo ha emenyu:
18. Unu echetala ihe mbu nile, unu atughari-kwa-la ihe nile nke mb͕e ochie n'obi.