10. Ma ub͕u a ọ̀ bu n'ejighi Jehova ka m'rigoro imegide ala nka ibibi ya? Jehova sirim, Rigo imegide ala nka, bibie ya.
11. Elaiakim na Shebna na Joa we si Rabshake, Biko, gwa ndi-orù-gi okwu n'asusu Siria; n'ihi na ayi onwe-ayi nānu ya: agwa-kwa-la ayi okwu n'asusu ndi-Ju, na nti ndi nọ n'elu mb͕idi.
12. Rabshake we si, Ọ̀ bu ijekuru onye-nwe-gi na ijekuru gi ka onye-nwem ziterem ikwu okwu ndia? ọ̀ bughi n'ihi ndikom ahu ndi nānọdu n'elu mb͕idi, ka ha we soro unu rie ǹsí-ha, ṅu kwa ma-amiri?
13. Rabshake we guzo, were oké olu kpọ n'asusu ndi-Ju, si, Nurunu okwu nile nke eze uku ahu, bú eze Asiria.