Aisaia 32:14-19 Bible Nso (IGBOB)

14. n'ihi na arapuwo ulo-elu; ab͕anariwo ìgwè obodo; Ofel na ulo nche anọchiwo n'ọnọdu ọb͕à rue mb͕e ebighi-ebi, ebe obi-utọ nke inyinya-ibu-ọhia, ebe-ita-nri nke ìgwè aturu di iche iche;

15. rue mb͕e agāwukwasi ayi Mọ site n'elu, ọzara ewe ghọ ubi ọma, agu kwa ubi ọma n'oké ọhia.

16. Mb͕e ahu ikpé ziri ezi gēnwe ebe-obibi-ya n'ọzara, ezi omume gēbi kwa n'ubi ọma ahu.

17. Ihe ezi omume ahu gāluputa bu udo; ihe nke gēsi n'òfùfè ezi omume ahu puta bu kwa inọ-jū na ntukwasi-obi rue mb͕e ebighi-ebi.

18. Ndim gānọ kwa n'ulo-obibi udo, na n'ebe-obibi di iche iche kwesiri ntukwasi-obi, na n'ebe-izu-ike di iche iche di jū.

19. Ma o gēzo ákú-miri-ígwé, n'ọdida nke oké ọhia; ọ bu kwa n'ọnọdu di ala ka agēme ka obodo a di ala.

Aisaia 32