17. Ọ̀ bughi nwa mb͕e ntà fọduru, Lebanon ewe ghọ ubi ọma, agu kwa ubi ọma n'oké ọhia?
18. Ndi nti chiri gānu kwa okwu nile nke akwukwọ n'ubọchi ahu, ọ bu kwa n'oké ọchichiri na n'ọchichiri ka anya ndi-ìsì gēsi hu uzọ.
19. Ndi di ume-ala n'obi gātukwasi kwa ihe n'ọṅù-ha nime Jehova, ndi-obeye n'etiti madu gēteghari kwa egwú ọṅù n'Onye Nsọ nke Israel.