Aisaia 29:15-19 Bible Nso (IGBOB)

15. Ahuhu gādiri ndi nēzonari Jehova ndum-ọdu-ha n'ebe di omimi, ndi ọ bu kwa n'ọchichiri ka anālu ọlu nile ha, ha we si, Ònye nāhu ayi? ma-ọbu ònye mara ayi?

16. Le, ka unu si ekpù ihe iru nke-uku! Ọ̀ bu n'urọ ka agāgu ọkpu-ite? na ihe emere eme gēkwu okwu bayere onye meworo ya, si, O meghm; ma-ọbu na ihe akpuru akpu gēkwu okwu bayere onye kpuworo ya, si, Ọ ghọtaghi.

17. Ọ̀ bughi nwa mb͕e ntà fọduru, Lebanon ewe ghọ ubi ọma, agu kwa ubi ọma n'oké ọhia?

18. Ndi nti chiri gānu kwa okwu nile nke akwukwọ n'ubọchi ahu, ọ bu kwa n'oké ọchichiri na n'ọchichiri ka anya ndi-ìsì gēsi hu uzọ.

19. Ndi di ume-ala n'obi gātukwasi kwa ihe n'ọṅù-ha nime Jehova, ndi-obeye n'etiti madu gēteghari kwa egwú ọṅù n'Onye Nsọ nke Israel.

Aisaia 29