14. N'ihi nka nurunu okwu Jehova, unu ndi nākwa emò, ndi nāchi ndi nka bi na Jerusalem:
15. N'ihi na unu asiwo, Ayi na ọnwu ab͕awo ndu, ayi na ala-mọ ekweritawo kwa nkwa; mb͕e utari nke nērubiga ókè dika miri gāgabiga, ọ gaghi-abiakute ayi; n'ihi na ayi emewo ka okwu-ugha buru ebe-nb͕abà-ayi, ọ bu kwa n'okwu-ugha ka ayi zobeworo onwe-ayi:
16. n'ihi nka otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, siri, Le, abum onye tọworo ntọ-ala na Zaion, bú otù nkume, nkume nke ọnwunwa, nkume-nkuku di oké ọnu-ahia nke bu ntọ-ala siri ike: onye nēkwere agaghi-ewere ọsọsọ b͕alaga.
17. M'gēme kwa ka ikpé buru eriri, me kwa ka ezi omume buru ihe-ọtùtù: ákú-miri-ígwé ewe kpochapu ebe-nb͕abà nke okwu-agha, miri gēruchapu kwa ebe-nzuzo.
18. Agēhichapu kwa ọb͕ub͕a-ndu unu na ọnwu b͕ara, nkwa unu na ala-mọ kweritara agaghi-eguzosi kwa ike; mb͕e utari nke nērubiga ókè dika miri gāgabiga, unu gāghọ-kwa-ra ya ebe-nzọda.