Aisaia 26:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. N'ubọchi ahu ka agābù abù a n'ala Juda: Obodo siri ike ka ayi nwere; nzọputa ka O gēdo ka ọ buru mb͕idi-ya nile na ékpè-ya.

2. Meghenu ọnu-uzọ-ama nile, ka mba nke nēme ezi omume nke nēdebe ikwesi-ntukwasi-obi nile we ba nime.

3. I nēchebe onye emeworo ka uche-ya dabere na Gi, ọ we nādizu n'udo: n'ihi na ọ bu Gi ka o nātukwasi obi.

4. Tukwasinu obi na Jehova rue mb͕e nile ebighi-ebi: n'ihi na Ja Jehova bu oké nkume nke mb͕e nile ebighi-ebi.

Aisaia 26