Aisaia 23:13-16 Bible Nso (IGBOB)

13. Le, ala ndi Kaldea; ndi nka adighi; Asiria edoziworo ya anu-ọhia nile nke biri n'ala kpọrọ nku: ha mere ka ulo-nche-ya nile guzosie ike, ha tikpọrọ ulo-elu-ya nile; o mere ya ka ọ ghọ ebe dara ada.

14. Kwasienu ákwá ike, unu ub͕ọ nke Tashish: n'ihi na ebibiwo ebe siri ike unu.

15. Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na agēchezọ Taia ọgu arọ atọ na iri, dika ubọchi nile nke otù eze si di: mb͕e ọgu arọ atọ na iri ahu gwusiri ọ gādiri Taia dika abù nwanyi nākwa iko.

16. Were ubọ-akwara, jegharia n'obodo buruburu, gi nwanyi nākwa iko nke echezọrọ echezọ; kpọ ya nke-ọma, bùa ọtutu abù, ka ewe cheta gi.

Aisaia 23