Aisaia 2:4-10 Bible Nso (IGBOB)

4. Ọ gēkpe kwa ikpe n'etiti mba nile, dozi-kwa-ra ọtutu ndi di iche iche okwu-ha: ha gākpughari kwa mma-agha-ha nile ka ha buru mma-ọgè, na ube-ha nile ka ha buru mma-ikwa-osisi: mba agaghi-ebuli mma-agha megide mba, ha agaghi-amuta kwa agha ọzọ.

5. Ulo Jekob, bianu, ka ayi jegharia n'ìhè Jehova.

6. N'ihi na I rapuwo ndi-Gi, bú ulo Jekob, n'ihi na ha juputara n'ome-n'ala site n'Iru-anyanwu, ha bu kwa ndi ji igwe-oji atù isi ọma na isi ọjọ dika ndi Filistia, ọzọ, ha na umu ndi ala ọzọ nēkwekọ aka.

7. Ala-ha juputa-kwa-ra n'ọla-ọcha na ọla-edo, ọ dighi kwa ọgwugwu diri àkù-ha; ala-ha juputa-kwa-ra n'inyinya, ọ dighi kwa ọgwugwu diri ub͕ọ-ala-ha.

8. Ala-ha juputa-kwa-ra n'ihe-efu; ọlu nke aka-ha ka ha nākpọ isi ala nye, bú ihe nke nkpisi-aka-ha mere.

9. Madu we ruda n'ala, onye di elu nēme kwa onwe-ya ka ọ di ala: ebupu-kwa-la nmehie-ha.

10. Ba n'oké nkume, zobe kwa onwe-gi n'ájá, ipu n'iru oké egwu Jehova, na ipu n'ima-nma nke idi-elu-Ya.

Aisaia 2