Ewepuwo kwa ọṅù na iteghari-egwú-ọǹù n'ubi ọma; agaghi-eti kwa nkpu ọṅù tisie ya ike n'ubi-vine nile: onye-nzọcha agaghi-azọchaputa manya-vine n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile; emewom ka iti-nkpu nzọcha-nkpuru-vine kwusi.