12. Le, otú i siworo n'elu-igwe da, gi Lusifa, nwa chi-ọbubọ! le, otú eb͕utuworo gi n'ala, gi onye nēme ka ike gwu mba nile!
13. Gi onwe-gi we si n'obi-gi, N'elu-igwe ka m'gārigo, n'elu kpakpando nile nke Chineke ka m'gēbuli oche-ezem; m'gānọkwasi kwa n'ugwu nzukọ, na nsọtu nile nke Ugwu:
14. m'gārigo n'elu ebe nile di elu nke igwe-oji; m'gēyi Onye kachasi ihe nile elu.
15. Otú ọ di, rue ala-mọ ka agēme ka i rida, rue nsọtu nile nke olùlù.
16. Ndi nāhu gi gēlegide gi anya, lekwasi gi anya, si Ọ̀ bu nka bu nwoke ahu nke nēme ka uwa ma jijiji, nke nēme ka ala-eze di iche iche me nkpatu;
17. nke mere elu-uwa dum madu bi ka ọ di ka ọzara, nke kwada-kwa-ra obodo-ya nile; nke nātọpughi ndi-nkpọrọ-ya ka ha la?
18. Eze nile nke mba nile, ọbuná ha nile, edinawo n'ala nime nsọpuru, onye ọ bula n'ulo-ya.