Abù Ọma 97:4-9 Bible Nso (IGBOB)

4. Àmùmà-Ya nile nyere elu-uwa dum madu bi ìhè:Uwa huru ya, o we gbue ya nb͕u.

5. Ugwu nile b͕azepuru dika wax n'iru Jehova,N'iru Onye-nwe uwa nile.

6. Elu-igwe gosiri ezi omume-Ya,Ndi nile di iche iche hu-kwa-ra ebube-Ya.

7. Ka ihere me ndi nile ndi nēfè arusi apiri api òfùfè,Ndi nānya isi n'ihe-efu di iche iche:Kpọnu isi ala nya Ya, unu chi nile.

8. Zaion nuru, we ṅuria,Umu-ndinyom Juda we tegharia egwu ọǹù;N'ihi ikpé-Gi nile, Jehova.

9. N'ihi na Gi onwe-gi, Jehova, bú Onye kachasi ihe nile elu n'elu uwa nile:Emewo ka I di elu nke-uku n'elu chi nile.

Abù Ọma 97