Abù Ọma 96:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Bùkuenu Jehova abù ọhu:Bùkuenu Jehova abù, unu uwa nile.

2. Bùkuenu Jehova abù, gọzienu aha-Ya;Nēzisanu ozi nzọputa-Ya site n'otù ubọchi rue ubọchi ọzọ.

3. Kọsanu akukọ ebube-Ya n'etiti mba nile,Akukọ oké ọlu-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche.

4. N'ihi na Jehova di uku, buru kwa onye anēto nke-uku:Onye anātu egwu Ya ka Ọ bu n'elu chi nile.

5. N'ihi na chi nile nke ndi nile di iche iche bu ihe-efu:Ma Jehova mere elu-igwe.

6. Ebube na ima-nma di n'iru Ya:Ike na nma di n'ebe nsọ Ya.

Abù Ọma 96