Abù Ọma 86:2-6 Bible Nso (IGBOB)

2. Debe nkpuru-obim; n'ihi na onye-ebere ka m'bu:Gi onwe-gi Chinekem, zọputa orù-Gi nke nātukwasi obi na Gi.

3. Merem amara, Onye-nwe-ayi;N'ihi na Gi ka m'nākpọku ogologo ubọchi nile.

4. Me ka nkpuru-obi orù-Gi ṅuria;N'ihi na ọ bu Gi, Onye-nwe-ayi, ka m'nēbuli nkpuru-obim nye.

5. N'ihi na Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, di nma, I bu kwa onye nāb͕aghara nmehie,I nāba kwa uba n'ebere n'aru ndì nile nākpọku Gi.

6. Jehova, ge nti n'ekperem;Ṅa kwa nti n'olu arirọ-amaram nile.

Abù Ọma 86