Abù Ọma 85:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova, ihe ala-Gi atọwo Gi utọ:I mewo ndi Jekob adọtara n'agha ka ha lata.

2. I bupuwo ajọ omume ndi-Gi,I kpuchiwo nmehie-ha nile. Selah

3. I kpochapuwo nrubiga-ókè nke iwe-Gi:I siwo n'di-ọku nke iwe-Gi chighari Onwe-gi.

4. Me ka ayi lata, Chineke nke nzọputa-ayi,Me ka ọ gwusia, bú iwe ayi nākpasu Gi.

5. Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka I ganēwesa ayi iwe?Ì gēme ka iwe-Gi digide rue ọb͕ọ nile?

6. Gì onwe-gi agaghi-eme ka ayi di kwa ndu ọzọ:Ka ndi-Gi we ṅuria nime Gi?

7. Jehova, me ka ayi hu ebere-Gi,Nye kwa ayi nzọputa-Gi.

Abù Ọma 85