7. N'ihi na ha eripiawo Jekob,Me kwa ka ebe-obibi-ya tọb͕ọrọ n'efu.
8. Echetala ajọ omume nile nke ndi-mbu-ayi imegide ayi:Kwe ka obi-ebere-Gi nile me ngwa izute ayi:N'ihi na ayi enweghi ike ma-ọli.
9. Yere ayi aka, Chineke nke nzọputa-ayi, n'ihi nsọpuru aha-Gi:Naputa kwa ayi, kpuchi kwa nmehie-ayi, n'ihi aha-Gi.
10. N'ìhi gini ka mba nile nāsi, Òle ebe Chineke-ha nọ?Ka amara ya n'etiti mba nile n'anya-ayi,Bú ibọ̀-ọ́bọ̀ ọbara nke ndi-orù-Gi nke awusiworo.