8. Ghara kwa idi ka ndi bu nna-ha,Ndi bu ọb͕ọ nēwezuga onwe-ha nke nānupu kwa isi;Ọb͕ọ ndi nēdozighi obi-ha,Ndi mọ-ha nēkwesighi ntukwasi-obi n'ebe Chineke nọ.
9. Umu Efraim, ọ bu ezie na ha nāchi ihe-agha nēbuli kwa uta,Ma ha chighariri n'ubọchi agha.
10. Ha edebeghi ọb͕ub͕a-ndu Chineke,Ma ha juru ijeghari n'iwu-Ya;
11. Ha we chezọ omume-Ya nile,Na oké ọlu-Ya nile nke O mere ka ha hu.
12. N'iru ndi bu nna-ha ka Ọ luru oké ọlu,N'ala Ijipt, n'ọhia Zoan.
13. O kewara oké osimiri, we me ka ha gabiga;O me-kwa-ra ka miri guzo ọtọ dika obo-ihe.
14. O ji-kwa-ra igwe-oji edu ha n'ehihie,Ji kwa ìhè ọku edu ha ogologo abali nile.
15. Ọ nākpọwa oké nkume di iche iche n'ọzara,We me ka ha ṅua miri ri nne dika o si nime ob͕u-miri puta.