Abù Ọma 74:14-18 Bible Nso (IGBOB)

14. Gi onwe-gi tipiasiri isi nile nke oké agu-iyi,I nēnye ya enye iburu otù ndi ihe-oriri, bú ndi bi n'ala kpọrọ nku.

15. Gi onwe-gi kewara isi-iyi na miri-iyi:Gi onwe-gi mere ka osimiri nile nke nērù erù mb͕e nile takọrọ.

16. Gi nwe ehihie, ọzọ kwa, Gi nwe abali:Gi onwe-gi edoziwo ihe nēnye ìhè na anyanwu.

17. Gi onwe-gi emewo ka ókè-ala nile nke uwa guzo ọtọ:Mb͕e okpom-ọku na mb͕e oyi, Gi onwe-gi akpuwo ha.

18. Cheta nka, na onye-iro atawo Jehova uta,Cheta kwa na otù ndi di nsọkwu eleliwo aha-Gi.

Abù Ọma 74