Abù Ọma 72:8-18 Bible Nso (IGBOB)

8. Ya nwe kwa ike n'aru madu site n'otù oké osimiri rue oké osimiri ọzọ,Site kwa n'Osimiri rue nsọtu nile nke uwa.

9. Ndi bi n'ala kpọrọ nku gēruru ala n'iru ya;Ọzọ, ndi-iro-ya gāracha ájá.

10. Ndi-eze Tashish na nke ala nile di oké osimiri buruburu gēnye onyinye-inata-iru-ọma:Ndi-eze Sheba na Seba gēweta ùtú nso.

11. E, eze nile gākpọ isi ala nye ya:Mba nile gēfè ya òfùfè.

12. N'ihi na ọ gānaputa ob͕eye mb͕e o nētiku ya;Ọ gānaputa kwa onye ewedara n'ala mb͕e ọ dighi onye nēyere ya aka.

13. Ọ gēmere onye nēnweghi ike na ob͕eye ebere,Ọ bu kwa nkpuru-obi ndi-ob͕eye ka ọ gāzọputa.

14. Ọ gēsi n'aka nzọb͕u na n'aka ime-ihe-ike b͕aputa nkpuru-obi-ha;Ọbara-ha gādi kwa oké ọnu-ahia n'anya-ya.

15. Ya di kwa ndu! agēnye kwa ya ufọdu n'ọla-edo Sheba:Agēkpe kwa ekpere bayere ya mb͕e nile;Ogologo ubọchi nile ka agāgọzi ya.

16. Ka ọtutu ọka di n'ala n'elu ugwu nile;Nkpuru-ya ganēme nkpatu dika Lebanon:Madu gēsi kwa n'obodo wa okoko-osisi dika ihe akuru n'ala.

17. Ka aha-Ya dirue mb͕e ebighi-ebi;N'iru anyanwu ka aha-Ya gāmu ọmùmù:Madu gāgọzi kwa onwe-ha nime ya:Mba nile gākpọ ya onye ihe nāgara nke-ọma.

18. Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke, bu, bú Chineke nke Israel,Onye nání Ya nālu oké ọlu di iche iche:

Abù Ọma 72