14. Mb͕e Onye Nke puru ime ihe nile chusara ndi-eze nime ya,Snow nēzò na Zalmon.
15. Ugwu Chineke ka ugwu Beshan bu;Ugwu nwere ugwu di iche iche n'elu ya ka ugwu Beshan bu.
16. Unu ugwu nwere ugwu n'elu unu, n'ìhi gini ka unu ji ekworoLe ugwu ahu anya nke Chineke chọsiworo ike ibu ebe-obibi-Ya?E, Jehova gēbi nime ya rue mb͕e ebighi-ebi.
17. Ub͕ọ-ala Chineke di orú nnú uzọ abua na nnù iri, ha di nnù abua na ọgu iri uzọ nādighi iguta ọnu:Onye-nwe-ayi nọ n'etiti ha, Sainai di nime ebe nsọ Ya.
18. I rigoruwo n'ebe di elu; dọta usu ndi adọtara n'agha n'agha;I natawo onyinye di iche iche n'etiti madu,E, ọbuná n'etiti ndi nēwezuga onwe-ha, ka Ja, bú Chineke, we biri n'etiti ha.
19. Onye agọziri agọzi ka Onye-nwe-ayi bu, kwa-ubọchi ka Ọ nēburu ayi ibu,Bú Chineke Nke bu nzọputa-ayi. Selah
20. Chineke buru ayi Chineke nāzọputa azọputa;Ọ bu kwa Johova, bú Onye-nwe-ayi, nwe uzọ nile isi n'ọnwu pua.
21. Ọ bu nání na Chineke gēb͕upú isi ndi-iro-Ya,Bú opu-n'isi arapuru ndundu nke onye nējeghari n'ikpe-ọmuma-ya.
22. Onye-nwe-ayi siri, M'gēme ka ha si na Beshan lata,M'gēme ka ha si n'ebe nile di omimi nke oké osimiri lata:
23. Ka I we b͕aye ukwu-gi n'ọbara,Ka ire nkita-gi nile we si n'aru ndi-iro-gi kère òkè-ya.
24. Ha ahuwo ojije-Gi nile, Chineke,Bú ojije nile nke Chinekem, bú Ezem, n'idi-nsọ-Ya.
25. Ndi-abù buru uzọ ga, ndi-ubọ-akwara soro n'azu,N'etiti umu-ab͕ọghọ ndi nēti egwú-otiti.
26. Nime nkpọkọta nile nke madu gọzienu Chineke,Bú Onye-nwe-ayi, unu ndi sitere n'isi-iyi Israel.
27. N'ebe ahu ka ọ nọ, bú Benjamin di ntà, nke nwere ike n'aru ha,Ya na ndi-isi Juda na ìgwè ndi-ha,Na ndi-isi Zebulum, na ndi-isi Naftali.
28. Chineke-gi enyewo ike-gi iwu:Di ike, Chineke, Gi Onye luworo ayi ọlu.
29. N'ihi ulo uku Gi nime JerusalemỌ bu Gi ka ndi-eze gēdukuru ùtú.
30. Basiere anu-ọhia nke amì nba ike,Ìgwè oke-ehi, ha na umu-ehi nke ndi nile di iche iche,Onye ọ bula nime ha nēkwe ka azọtọ ya n'ukwu nēweta iberibe ọla-ọcha;Ọ chusawo ndi nile di iche iche ndi ilu-ọ̀gù nātọ utọ.
31. Ndi amara aha-ha gēsi n'Ijipt puta;Etiopia gēsetiri Chineke aka-ya abua ngwa ngwa.
32. Unu ala-eze nke uwa, bùkuenu Chineke abù;Bùkuenu Onye-nwe-ayi abù ọma; Selah
33. Bùkuenu Onye ahu Nke elu-igwe kachasi elu-igwe nile, nke di mb͕e ochie, nēbu dika inyinya;Le, Ọ nēme ka olu-Ya da udà, ọ bu olu ike.