Abù Ọma 61:4-7 Bible Nso (IGBOB)

4. Ka m'nọ dika ọbìa n'ulo-ikwū-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi:M'gāb͕abà n'ebe-nzuzo nke nkù-Gi abua. Selah

5. N'ihi na Gi onwe-gi, Chineke, egewo nti nkwa nile m'kwere:I werewo ihe-nnweta nke ndi nātu egwu aha-Gi nye ha.

6. I gātukwasi ọtutu ubọchi n'ubọchi ndu eze:Arọ-ya nile gādi ka ọtutu ọb͕ọ.

7. O gēbi n'iru Chineke rue mb͕e ebighi-ebi:Wezuga ebere na ezi-okwu, ka ha we nēchezi ya.

Abù Ọma 61