1. Naputam n'aka ndi-irom, Chinekem:Me ka m'si n'aka ndi nēbili imegidem nọ n'ebe di elu.
2. Naputam n'aka ndi nālu ajọ ihe,Zọputakwam n'aka ndi-ọbara.
3. N'ihi na, le, ha echewo nkpuru-obim anwu;Ndi di ike nēzukọ imegidem:Ọ bughi n'ihi njehiem, ọ bughi kwa n'ihi nmehiem, Jehova.
4. Mb͕e ọ nādighi ajọ omume m'mere ha nāb͕a ọsọ, dozie onwe-ha:Kpọte Onwe-gi izutem, hu kwa.
5. Gi onwe-gi kwa, Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel,Teta ileta mba nile:Emelera ndi nāghọ aghughọ n'ajọ ihe amara. Selah