Abù Ọma 57:2-6 Bible Nso (IGBOB)

2. M'gākpọku Chineke Onye kachasi ihe nile elu;M'gākpọku Chineke Onye nēmezurum ihe.

3. O gēsi n'elu-igwe zìe, zọputam,Mb͕e onye nēkusi ume ike ilom nāta uta; SelahChineke gēziputa ebere-Ya na ezi-okwu-Ya.

4. Nkpuru-obim nọ n'etiti ọdum;M'gēdina n'etiti ndi nēre ọku,Bú umu madu, ndi ezé nile ha bu ube na àkú,Ire-ha bu kwa mma-agha di nkọ.

5. Me Onwe-gi ka I di elu n'elu elu-igwe nile, Chineke;Ka ebube-Gi di elu n'elu uwa nile.

6. Ub͕u ka ha doziworo nzọ-ukwum nile;Nkpuru-obim erudawo n'ala:Ha egwuwo olùlù n'irum;Ha adabàwo n'etiti ya. Selah

Abù Ọma 57