Abù Ọma 51:7-11 Bible Nso (IGBOB)

7. I gēwere hyssop wepu nmehiem, m'gādi kwa ọcha:I gāsucham dika ákwà, m'gādi kwa ọcha kari snow.

8. I gēme ka m'nuru olu obi-utọ na ọṅù;Ka ọkpukpu nile I gwepiaworo we tegharia egwú-ọṅù.

9. Zopu iru-Gi na nmehiem nile,Hichapu kwa ajọ omumem nile.

10. Kèrem obi di ọcha, Chineke;Me kwa ka mọ nke nēguzosi ike di ọhu nimem.

11. Atupulam n'iru Gi;Anara-kwa-lam Mọ Nsọ Gi.

Abù Ọma 51