10. N'ihi na Mu nwe anu-ọhia ọ bula nke oké ọhia,Ya na anu nile n'elu nnù ugwu abua na ọgu iri.
11. Amawom anu-ufe ọ bula nke ugwu nile:Anu nile nke nēnughari n'ọhia di kwa n'akam.
12. Ọ buru na agu aguam, M'gaghi-agwa gi:N'ihi na Mu nwe elu-uwa dum madu bi na ùjú-ya.
13. M'gēri anu oke-ehi?Ọ̀ bu ọbara nkpi ka m'gāṅu?
14. Chuara Chineke ekele dika àjà;Kwughachi kwa Onye kachasi ihe nile elu nkwa nile i kwere: