15. Anyam abua di n'ebe Jehova nọ mb͕e nile;N'ihi na Ya onwe-ya gēme ka ukwum abua si n'ub͕u puta.
16. Chem iru, me-kwa-ram amara;N'ihi na onye nání ya nọ na onye ewedara n'ala ka m'bu.
17. Ahuhu nile nke obim sara mbara:Me ka m'si na nkpàm nile puta.
18. Hu nweda-n'alam na ọnọdu ọjọm;Bupu kwa nmehiem nile.
19. Hu ndi-irom, n'ihi na ha di ọtutu;Ha ji ikpọ-asi nke na-eme ihe-ike kpọm asi.
20. Debe nkpuru-obim, naputakwam:Ekwela ka ihere mem, n'ihi na ab͕abàwom nime Gi.