Abù Ọma 22:4-11 Bible Nso (IGBOB)

4. Na Gi ka nna-ayi-hà tukwasiri obi:Ha tukwasiri obi, I we me ka ha b͕apu.

5. Gi ka ha tikuru, eme-kwa-ra ka ha wepuga onwe-ha:Na Gi ka ha tukwasiri obi, ihere emeghi kwa ha.

6. Ma mu onwem bu idide, ọ bughi kwa madu ka m'bu;Abum ihe-ita-uta nke mmadu, na onye ndim neleda anya.

7. Ndi nile ndi nāhum nāchìm ọchi:Ha na-enu ọnu, fufè isi, si,

8. Turu onwe-gi rue Jehova aru; Ya me ka ọ b͕apu:Ya naputa ya, n'ihi na ihe-ya atọwo Ya utọ.

9. Otú ọ di, Gi onwe-gi bu onye meworo ka m'waputa n'afọ nnem:I nēme ka m'tukwasi obi mb͕e m'nọ nara nnem.

10. Na Gi ka atukwasirim site n'àkpà-nwa:Site n'afọ nnem ka Gi onwe-gi bu Chinekem.

11. Anọlam n'ebe dí anya; n'ihi na nkpab͕u di nso;N'ihi na ọ dighi onye nēyerem aka.

Abù Ọma 22