Abù Ọma 22:16-21 Bible Nso (IGBOB)

16. N'ihi na nkita dim buruburu:Nzukọ ndi nēme ihe ọjọ ab͕awom buruburu;Ha nādupú akam abua na ukwum abua.

17. Anamagu ọkpukpum nile ọnu;Ndi ahu nēlegide nēlekwam anya:

18. Ha nēkère onwe-ha uwem,N'elu ihe m'nēyi n'aru ka ha nēfe kwa nzà.

19. Ma Gi onwe-gi, Jehova, anọla n'ebe di anya:Gi ikem, bia ọsọsọ iyerem aka.

20. Naputa nkpuru-obim na mma-agha;Naputa nkpuru-obi m'nwere nání ya náka nkita.

21. Zọputam n'ọnu ọdum;Ọzọ, site na mpi atu ka I zaworom.

Abù Ọma 22