Abù Ọma 22:10-17 Bible Nso (IGBOB)

10. Na Gi ka atukwasirim site n'àkpà-nwa:Site n'afọ nnem ka Gi onwe-gi bu Chinekem.

11. Anọlam n'ebe dí anya; n'ihi na nkpab͕u di nso;N'ihi na ọ dighi onye nēyerem aka.

12. Ọtutu oke-ehi dim buruburu:Oke-ehi di ike nke Beshan ab͕awom buruburu.

13. Ha asaghepuwo ọnu-ha n'arum,Dika ọdum nke nādọb͕u anu, nke nāb͕ọ kwa uja.

14. Dika miri ka awusiworom,Ọkpukpum nile ekesawo onwe-ha:Obim aghọwo ihe dika wax;Ọ lọwo miri n'etiti afọm.

15. Ikem akpọwo nku di ka osisi;Irem nārapara kwa n'ab͕am;Ọ bu kwa n'ájá ọnwu ka I nātọb͕ọm.

16. N'ihi na nkita dim buruburu:Nzukọ ndi nēme ihe ọjọ ab͕awom buruburu;Ha nādupú akam abua na ukwum abua.

17. Anamagu ọkpukpum nile ọnu;Ndi ahu nēlegide nēlekwam anya:

Abù Ọma 22