Abù Ọma 18:20-25 Bible Nso (IGBOB)

20. Jehova nēnyeghachim dika ezi omumem si di;Dika idi-ọcha akam abua si di, otú a ka O nēmeghachim ọzọ.

21. N'ihi na edebewom uzọ nile nke Jehova,Emebighikwa m iwu n'ipu n'aka Chinekem.

22. N'ihi na ikpé-Ya nile di n'irum,Ukpuru-Ya kwa, adighm-ewezuga ha n'ebe m'nọ.

23. M'we zue okè n'ebe Ọ nọ,Edebe-kwa-ram onwem pua n'ajo omumem.

24. Jehova we meghachim dika ezi omumem si di,Dika idi-ọcha akam abua n'anya-Ya si di.

25. N'ebe onye-ebere nọ I gēgosi Onwe-gi onye-ebere;N'ebe nwoke zuru okè nọ I gēgosi Onwe-gi onye zuru okè;

Abù Ọma 18