9. Ọ buru na achirim nkù nke ututu,Biri n'akuku dikarisiri anya nke oké osimiri,
10. Ọbuná n'ebe ahu ka aka-Gi gēdurum,Aka-nri-gi gējidekwam.
11. M'we si, N'ezie, ọchichiri gēkpuchim;Ma abali ghọrọ ìhè buruburum.
12. Ọbuná ọchichiri adighi-ab͕achiri Gi;Ma abali nēnye ìhè dika ehihie:Dika ọchichiri si di, otú a ka ìhè di n'anya-Gi