3. Udọ̀ nile nke ọnwu b͕aram buruburu,Ebe nile di nkpà nke ala-mọ chọtaram:Ahuhu na iru-újú ka m'nāhu.
4. M'we kpọkue aha Jehova;Si, Biko, Jehova, me ka nkpuru-obim wepuga onwe-ya.
5. Onye-amara na onye ezi omume ka Jehova bu;E, Chineke-ayi nwere obi-ebere.
6. Onye nēdebe ndi nēnweghi uche ka Jehova bu:Enweghm ike, O we nyem nzọputa.
7. Nkpuru-obim, laghachi n'ebe-izu-ike-gi;N'ihi na Jehova emesowo gi nke-ọma.