Abù Ọma 115:11-14 Bible Nso (IGBOB)

11. Unu ndi nātu egwu Jehova, tukwasinu Jehova obi:Iye-aka-ha na ota-ha ka Ọ bu.

12. Jehova echetawo ayi: Ọ gāgọzi ayi:Ọ gāgọzi ulo Israel;Ọ gāgọzi ulo Eron.

13. Ọ gāgọzi ndi nātu egwu Jehova,Ma ndi ntà ma ndi uku.

14. Ka Jehova tukwasiri unu madu,Ka Ọ tukwasiri unu, tukwasi-kwa-ra umu-unu.

Abù Ọma 115