Abù Ọma 103:14-18 Bible Nso (IGBOB)

14. N'ihi na Ya onwe-ya mara otú akpuworo ayi;Ọ nēcheta na ájá ka ayi bu.

15. Ma madu, dika ahihia ka ubọchi-ya nile di;Dika okoko-osisi ọhia, otú a ka ọ nāwa okoko.

16. N'ihi na ifufe agabigawo ya n'isi, o we ghara idi;Ọnọdu-ya agaghi-ama kwa ya ọzọ.

17. Ma ebere nke Jehova nēsi na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi n'aru ndi nātu egwu Ya,Ezi omume-Ya di-kwa-ra umu umu;

18. Ọ diri ndi nēdebe ọb͕ub͕a-ndu-Ya,Di-kwa-ra ndi nēcheta ukpuru-Ya ime ha.

Abù Ọma 103