9. Onye ihe-ya nātọm utọ yiri mb͕ada ma-ọbu nwa-ele:Le kwa, ọ nēguzo n'azu mb͕idi-ayi,Ọ nēsi na window nile lebata anya,Anya-ya nēsi n'oghere-inara-ifufe nwubata.
10. Onye ihe-ya nātọm utọ zara, sim,Bilie, eyìm, onye nkem nke mara nma, bia.
11. N'ihi na, le, mb͕e oyi agabigawo,Oké miri-ozuzo agawo, ọ lawo;
12. Ahuwo okoko-ọhia anya n'ala;Mb͕e abù ọma nke umu-nnunu eruwo,Anuwo kwa olu nduru n'ala-ayi;