12. Ha nāsi nne-ha, Òle ebe ọka na manya-vine di?Mb͕e ha nāda #mbà dika onye emeruru aru n'amá nile nke obodo,Mb͕e nkpuru-obi-ha nāwusi onwe-ya dika miri n'obi ndi bu nne-ha.
13. Gini, bu àmà M'gāb͕ara gi? gini ka M'gēji tuyere gi, gi ada Jerusalem?Gini ka M'gēme ka gi na ya rata, ka M'we kasie gi obi, gi ada Zaion nāmaghi nwoke?N'ihi na ihe di uku dika oké osimiri ka nb͕awa-gi bu: ònye gāgwọta gi?
14. Ndi-amuma-gi ahutaworo gi ọhù ihe-efu na ihe-nzuzu;Ma ha ekpugheghi ajọ omume-gi, ime ka ndi-gi adọtara n'agha lata:Kama ha ahutaworo gi ibu di iche iche nke ihe-efu na ihe-nchupu di iche iche.