2. Timọti 4:13-16 Bible Nso (IGBOB)

13. Uwe nāchu oyi nke m'rapuru na Troas n'aka Kapọs, weta ya mb͕e i gābia, ya na akwukwọ nile, ma nke kachasinu, weta akwukwọ parchment nile.

14. Aleksanda onye nākpu ọlà merem ọtutu ihe ọjọ: Onye-nwe-ayi gēnyeghachi ya ihe dika ọlu-ya nile si di:

15. gi onwe-gi nēche kwa onye ahu nche; n'ihi na o guzogidere okwu-ayi nke-uku.

16. Na ngọpum mbu ọ dighi onye ọ bula nọ n'akukum, kama madu nile rapuru náním: ka aghara igu ya n'isi-ha.

2. Timọti 4