8. Nēcheta Jisus Kraist, dika Onye emeworo ka O si na ndi nwuru anwu bilie, Onye si na nkpuru Devid puta, dika ozi ọmam si di:
9. nke m'nāhuju anya nime ya rue ab͕u, dika onye nālu ọlu ọjọ; ma ekeghi okwu Chineke ab͕u.
10. N'ihi nka ka m'nwere ntachi-obi n'ihe nile n'ihi ndi arọputara, ka ha onwe-ha we ru kwa nzọputa nke di nime Kraist Jisus, ya na ebube ebighi-ebi.
11. Okwu a kwesiri ntukwasi-obi: N'ihi na asi na ayi soro Ya nwukọ ọnwu, ayi gēso kwa Ya dikọ ndu:
12. asi na ayi nēnwe ntachi-obi, ayi gēso kwa Ya bukọ eze: asi na ayi gāgọnari Ya, Ya onwe-ya gāgọnari kwa ayi:
13. asi na ayi ekweghi ekwe, Ya onwe-ya nānọgide n'ikwesi ntukwasi-obi; n'ihi na Ọ pughi igọnari Onwe-ya.