2. Timọti 1:4-11 Bible Nso (IGBOB)

4. n'ihi na agu ihu gi nāgusim ike abali na ehihie, ebe m'nēcheta anya-miri-gi nile, ka m'we juputa n'ọṅù;

5. ebe emerem ka m'cheta okwukwe iru-abua nādighi ya nke di nime gi; bú okwukwe nke buru uzọ biri nime nne-gi ochie Lois na nne-gi Yunaisi; ma emerem ka m'kweye na o bi kwa nime gi.

6. Ọ bu kwa n'ihi ihe a ka m'nēchetara gi ka i me ka onyinye-amara nke Chineke nwuru ọku, bú nke di nime gi site n'ibikwasi aka abua nkem n'isi-gi.

7. N'ihi na Chineke enyeghi ayi mọ nke ujọ; kama ọ bu nke ike na ihunanya na ime ka uche zuo okè.

8. Ya mere ka ihere àmà nke Onye-nwe-ayi, ma-ọbu ihere nke mu onye-nkpọrọ-Ya, ghara ime gi: kama so ozi ọma Ya hujukọ anya dika ike nke Chineke si di;

9. Onye zọputara ayi, were kwa ọkpukpọ di nsọ kpọ ayi, ọ bughi dika ọlu-ayi si di, kama dika ihe Ya onwe-ya zubere, na amara-Ya, si di, nke enyere ayi nime Kraist Jisus mb͕e oge ebighi-ebi akērughi,

10. ma emere ka ọ puta ìhè ub͕u a site na ngosi nke Onye-nzọputa-ayi Kraist Jisus, Onye mere ka ọnwu ghara idi ìrè, site kwa n'ozi ọma Ya weputa ndu na emebighi-emebi n'ìhè,

11. bú ozi ọma nke edoro mu onwem ka m'buru onye-nkwusa, na onye-ozi, na onye-ozizí, izisa ya.

2. Timọti 1