2. Samuel 8:11-18 Bible Nso (IGBOB)

11. ihe ndia ka eze, bú Devid, do-kwa-ra nsọ nye Jehova, tiyere ọla-ọcha na ọla-edo nke o doro nsọ site na mba nile nke o budara;

12. site na Siria, site kwa na Moab, site kwa n'umu Amon, site kwa na ndi Filistia, site kwa n'Amalek, site kwa n'ihe-nkwata Hedadeza, nwa Rehob, bú eze Zoba.

13. Devid we mere onwe-ya aha mb͕e o siri n'itib͕u Siria nime Ndagwurugwu Nnù lata, bú orú nnù ndikom uzọ abua na nnù ise.

14. O tiye-kwa-ra ebe-nguzo-ndi-agha n'Edom: n'Edom nile ka o tiyere ebe-nguzo-ndi-agha, Edom nile we ghọrọ Devid ndi-orù. Jehova we nāzọputa Devid ebe ọ bula ọ jere.

15. Devid we buru eze Israel nile; Devid we nēmere ndi-ya nile ihe ekpere n'ikpe na ezi omume.

16. Joab nwa Zeruaia bu onye-isi usu-ndi-agha; Jehoshafat nwa Ahailud bu onye-ncheta:

17. Zedok nwa Ahaitub, na Ahimelek nwa Abaiata, bu ndi-nchu-àjà; Seraia bu ode-akwukwọ;

18. Benaia nwa Jehoiada bu onye-isi ndi Keret na ndi Pelet; umu-ndikom Devid bu ndi-isi n'ije ozi.

2. Samuel 8