2. Samuel 7:8-17 Bible Nso (IGBOB)

8. Ma ub͕u a, otú a ka i gāsi orùm, bú Devid, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Mu onwem siri n'ebe-ita-nri anu-ulo, si kwa n'ebe i nēso ìgwé ewu na aturu, kuru gi, ka i buru nye-ndú ndim, bú Israel:

9. M'we nọyere gi n'ebe ọ bula i jere, ebipu-kwa-ram ndi-iro-gi nile n'iru gi; M'gēme-kwa-ra gi aha uku, dika aha ndi uku ndi nọ n'uwa.

10. M'gēdo-kwa-ra ndim, bú Israel, otú ebe, ku kwa ha dika osisi, ka ha we biri n'ọnọdu-ha, ghara ima jijiji ọzọ; umu ajọ omume agaghi-eweda kwa ha ọzọ, dika na mbu,

11. na dika site n'ubọchi mb͕e M'nyere ndi-ikpe iwu ibu ndi-isi ndim, bú Israel; emewokwam ka i zuru ike pua n'aka ndi-iro-gi nile. Jehova egosiwo kwa gi na Jehova gēmere gi ulo.

12. Mb͕e ubọchi-gi zuru, mb͕e gi gēsoro nna-gi-hà dina kwa n'ọnwu, M'gēme kwa ka o bilie, bú nkpuru-gi nke gānọchi gi, nke gēsi n'afọ-gi puta, M'gēme kwa ka ala-eze-ya guzosie ike.

13. Onye ahu gēwuru aham ulo, M'gēme kwa ka oche-eze nke ala-eze-ya guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi.

14. Mu onwem gāburu ya nna, ya onwe ya gābu-kwa-ram nwa: ọ buru na ọ me ajọ omume, M'gēwere nkpa-n'aka madu, were kwa ihe-otiti nke umu madu, dua ya ọdu;

15. ma eberem agaghi-esi n'ebe ọ nọ wezuga onwe-ya, dika M'wēzugara ya n'ebe Sọl nọ, onye M'wezugara n'iru gi.

16. Ma ulo-gi na ala-eze-gi gēkwesi ntukwasi-obi n'iru gi rue mb͕e ebighi-ebi: agēme ka oche-eze-gi buru ihe guzosiri ike rue mb͕e ebighi-ebi.

17. Dika okwu ndia nile si di, na dika ọhù a nile si di, otú a ka Netan gwara Devid okwu.

2. Samuel 7