1. Ish-boshet nwa Sọl we nu na Abnea anwuwo nime Hebron, aka-ya we kuda, Israel nile ma-kwa-ra jijiji.
2. Ma Ish-boshet nwa Sọl nwere ndikom abua ndi bu ndi-isi usu ndi nāpunara madu ihe: aha otù bu Beana, aha nke-ọzọ bú Rikab, ha bu umu Rimon onye Beirot, sitere n'umu Benjamin: (n'ihi na anāgu-kwa-ra Benjamin, Beirot:
3. ndi Beirot we b͕alaga na Gitaim, buru ndi-ọbìa n'ebe ahu rue ta.)
4. Ma Jonatan nwa Sọl nwere nwa-nwoke nke dara ngwurọ n'ukwu-ya abua. Ọ b͕ara arọ ise mb͕e akukọ Sọl na Jonatan siri na Jezreel bia, nwayi nāzù ya we kuru ya, b͕alaga: o rue, mb͕e ọ nēme ngwa ib͕alaga, na nwata ahu dara ada, we ghọ onye-ngwurọ. Aha-ya bu Mefiboshet.