4. Ndi Gibeon we si ya, Ọ dighi ọla-ọcha ma-ọbu ọla-edo diri ayi n'ebe Sọl nọ, ma-ọbu n'ebe ulo-ya nọ: ọ dighi kwa nwoke ọ bula agēme ka ọ nwuara ayi n'Israel. O we si, Ihe unu onwe-unu nāsi, ihe ahu ka m'gēmere unu.
5. Ha we si eze, Nwoke ahu nke mere ka ayi gwusia, nke zube-kwa-ra imegide ayi, ewe kpochapu ayi ka ayi ghara iguzo onwe-ayi n'ókè-ala ọ bula nke Israel,
6. ka enye ayi ndikom asa sitere n'umu-ya, ayi gākwuba kwa ha nye Jehova nime Gibea Sọl, onye Jehova rọputara. Eze we si, Mu onwem gēnye unu ha.
7. Ma eze nwere ọmiko n'aru Mefiboshet, nwa Jonatan nwa Sọl, n'ihi ọṅuṅu-iyi Jehova nke di n'etiti ha, bú n'etiti Devid na Jonatan nwa Sọl.
8. Eze we chiri umu-ndikom abua nke Rizpa nwa-nwayi Aia, ndi ọ muru Sọl, bú Amoni na Mefiboshet; na umu-ndikom ise nke Maikal nwa-nwayi Sọl, ndi ọ muru Adriel nwa Bazilai onye Mehola: