2. Samuel 18:3-6 Bible Nso (IGBOB)

3. Ndi-ya we si, I gaghāpu: n'ihi na ọ buru na ayi ab͕alaga ab͕alaga, ha agaghi-atukwasi ayi obi: ọ buru kwa na nkera nime ayi anwua, ha agaghi-atukwasi ayi obi: n'ihi na ub͕u a orú nnù ndikom na nnù ise dika ayi di; ma ub͕u a ọ di nma ka i buru ayi onye-iye-aka site n'obodo.

4. Eze we si ha, Ihe di nma n'anya-unu ka m'gēme. Eze we guzo n'akuku ọnu-uzọ-ama, ndi-ya nile we nāpu n'ọgu ise ọgu ise, na nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri.

5. Eze we nye Joab na Abishai na Itai iwu, si, Menu nwayọ n'aru nwa-okorọbia, bú Absalom, n'ihim. Ndi-ya nile nu-kwa-ra mb͕e eze nyere ndi-isi nile iwu bayere Absalom.

6. Ndi-ya we pua je n'ọhia izute Israel: agha ahu we di n'oké ohia Efraim.

2. Samuel 18