2. Samuel 18:11-19 Bible Nso (IGBOB)

11. Joab we si nwoke ahu nke nēgosi ya, Ma, le, i huru ya, ma gini mere i tib͕ughi ya n'ebe ahu rue ala? ọ gābu kwa ọlum inye gi ọla-ọcha iri, na otù ihe-ọkiké.

12. Nwoke ahu we si Joab, Ọ buru kwa na mu onwem ejide n'ọbu-akam nnù ọla-ọcha abua na ọgu iri, ma m'gaghi-eseti akam imegide nwa eze: n'ihi na ọ bu na nti-ayi ka eze nyere gi na Abishai na Itai iwu, si, Lezienu anya bayere nwa-okorọbia ahu, bú Absalom, onye ọ bula.

13. Ma asi na emem otú a, m'gēme ihe-ugha megide ndum, (ma ọ dighi okwu ọ bula agēzonari eze,) gi onwe-gi gēguzo kwa onwe-gi n'akuku ọzọ.

14. Joab we si, Ọ bughi otú a ka m'ganēche n'iru gi. O we chiri nkpa-n'aka atọ n'aka-ya, dubà ha n'obi Absalom, mb͕e ọ nānọ na ndu n'etiti osisi terebinth.

15. Umu-okorọbiua iri ndi nēbu ihe-agha Joab we b͕a gburugburu, tib͕ue Absalom, me ka o nwua.

16. Joab we fùa opì-ike, ndi Devid we si n'ichu Israel n'azu lata: n'ihi na Joab b͕ochiri ndi ahu.

17. Ha we were Absalom, tubà ya n'olùlù uku n'oké ọhia ahu, me ka oké obo uku nke nkume guzo n'elu ya: Israel nile we b͕alaga, onye ọ bula n'ulo-ikwū-ya

18. Ma Absalom, mb͕e ọ nọ na ndu, o were ogidi nke di na ndagwurugwu eze guzoro onwe-ya: n'ihi na ọ siri, Enweghm nwa-nwoke ime ka echeta aham: o we kpọ ogidi ahu n'aha-ya: ewe kpọ ya ihe-ncheta Absalom, rue ta.

19. Ahimaaz nwa Zedok we si, Biko, ka m'b͕a ọsọ zìe eze ozi ọma, na Jehova ekpeputawo ya n'aka ndi-iro-ya.

2. Samuel 18