2. Samuel 15:2-20 Bible Nso (IGBOB)

2. Absalom we bilie n'isi-ututu, guzo n'akuku uzọ ọnu-uzọ-ama: o rue, mb͕e nwoke ọ bula nwere okwu nke gēru eze nti ka o we kpe ya, na Absalon kpọro ya, si, Òle obodo gi onwe-gi si bia? Ọ si, Otú nime ebo Israel ka orù-gi si bia.

3. Absalom we si ya, Le, okwu-gi nile di nma, zi kwa ezi; ma ọ dighi onye nēge gi nti site n'ebe eze nọ.

4. Absalom we si, Ònye gēdom onye-ikpe n'ala nka, ka nwoke ọ bula nke nwere okwu ma-ọbu ikpé we biakutem, m'we kpọ ya onye ezi omume!

5. O rue, mb͕e nwoke ọ bula biaruru ya nso ikpọ isi ala nye ya, na o setiri aka-ya, jide ya, sututu ya ọnu.

6. Absalom we mere Israel nile dika okwu a si di, bú ndi biakutere eze ka ekpe ha ikpe: Absalom we zuru obi ndikom Israel n'ori.

7. O rue, n'ọgwugwu ọgu arọ abua, na Absalom siri eze, Biko, ka m'je kwughachi nkwam, nke, m'kwere Jehova, nime Hebron.

8. N'ihi na orù-gi kwere nkwa mb͕e m'biri na Geshua nime Siria, si, Ọ buru na Jehova eme ka m'laghachi na Jerusalem n'ezie, m'gēfè kwa Jehova òfùfè.

9. Eze we si ya, Je n'udo. O we bilie, jerue Hebron.

10. Absalom we ziga ndi-nledo n'ebo nile nke Israel, si, Mb͕e unu nuru olu opì-ike, unu gāsi kwa, Absalom bu eze na Hebron.

11. Ọgu ndikom iri we si na Jerusalem soro Absalom je, bú ndi akpọrọ, ha we nēje n'izu-okè obi-ha; ma ha amaghi ihe ọ bula.

12. Absalom we zipu Ahitofel onye Gailo, bú onye nādu Devid ọdu, n'obodo-ya, bú Gailo mb͕e ọ nāchu àjà. Nkekọta ahu we di ike; ndi Israel nāba kwa uba nēje n'iru n'iru n'aka Absalom.

13. Onye nēgosi ihe we biakute Devid, si, Obi ndikom Israel di iso Absalom n'azu.

14. Devid we si ndi-orù-ya nile, ndi ya na ha nọ na Jerusalem, Bilienu, ka ayi b͕apu; n'ihi na ayi enweghi nb͕apu n'iru Absalom: menu ngwa ije, ka o we ghara ime ngwa rue ayi aru, me ka ihe ọjọ kwagide ayi, were ọnu mma-agha tib͕ue obodo a.

15. Ndi-orù eze we si eze, Dika ihe nile si di nke onye-nwem, bú eze, garọputa, le, ndi-orù-gi.

16. Eze we pua, ya na ulo-ya nile ndi soro ya n'ukwu n'ukwu. Eze we rapu ndinyom iri, bú ndi-iko-ya nwayi, iche ulo.

17. Eze we pua, ya na ndi-ya nile ndi soro ya n'ukwu n'ukwu; ha we nọdu na Bet-meahak.

18. Ndi-orù-ya nile we nāgabiga n'akuku ya; ndi Keret nile, na ndi Pelet nile, na ndi Gat nile, bú nnù ndikom na ọgu iri ndi siri na Gat bia, soro ya n'ukwu n'ukwu, nāgabiga kwa n'iru eze.

19. Eze we si Itai, bú onye Gat, N'ìhi gini ka gi onwe-gi nēso kwa ayi je? laghachi, soro eze nọdu: n'ihi na onye ala ọzọ ka i bu, onye rapuru ala-ya ka i bu kwa; laghachi n'ebe-gi.

20. nyahuru bu ọbibia-gi, ọ̀ bu ta ka m'gēme gi ka i ṅagharia n'iso ayi je, n'ihi na mu onwem nēje ebe mu onwem nēje? gi laghachi, me kwa ka umu-nne-gi laghachi; ka ebere na ezi-okwu diyere gi.

2. Samuel 15