2. Samuel 13:22-26 Bible Nso (IGBOB)

22. Ma Absalom agwaghi Amnon okwu ọ bula ma ọ bu nke di njọ ma-ọbu nke di nma: n'ihi na Absalom kpọrọ Amnon asì. n'ihi na ọ wedara Tema nwa-nne-ya n'ala.

23. O rue, mb͕e arọ abua zuru ezu gasiri, na Absalom nwere ndi nākpacha aji anu na Beal-hezoa, nke di n'akuku Efraim: Absalom we kpọ umu-ndikom eze nile.

24. Absalom we biakute eze, si, Biko, le, Orù-gi nwere ndi nākpacha aji anu; biko, ka eze na ndi-orù-ya soro orù gi je.

25. Eze we si Absalom, É-è, nwam, biko, emela ka ayi nile je, ka ayi we ghara ibu edi arọ́ n'isi gi. O rugid ya: ma o kweghi ije, ma ọ gọziri ya.

26. Absalom we si, Ma ọ buru na i jeghi, biko, ka Amnon nwa-nnem soro ayi je. Eze we si ya, Nìhi gini ka ọ gēsoro gi je?

2. Samuel 13