2. Samuel 11:9-14 Bible Nso (IGBOB)

9. Ma Uraia dinara n'ọnu-uzọ ulo eze n'etiti ndi-orù nile nke onye-nwe-ya, ọ ridaghi kwa rue ulo-ya.

10. Ha we gosi Devid, si, Uraia aridaghi rue ulo-ya. Devid we si Uraia, Ọ̀ bughi n'ije ka gi onwe-gi si bia? gini mere i ridaghi rue ulo-gi?

11. Uraia we si Devid, Ib͕e Chineke, na Israel, na Juda, nānọdu n'ulo-ntu; onye-nwem Joab na ndi-orù onye-nwem nānọ kwa n'ulo-ikwū n'ọhia; ma mu onwem, m'gābà n'ulom, iri ihe na iṅu ihe-ọṅuṅu, na isoro nwunyem dina? ndu-gi, na ndu nkpuru-obi-gi, ma ọ buru na emem ihe a.

12. Devid we si Uraia, Nọdu kwa n'ebe a ta, echi ka m'gezilaga kwa gi. Uraia we nọdu na Jerusalem ubọchi ahu na echi-ya.

13. Devid we kpọ ya, o we rie ihe n'iru ya, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu; Devid we me ya ka ọ ṅubiga manya okè: o we pua n'anyasi idina n'ihe-ndina-ya n'etiti ndi-orù onye-nwe-ya, ma ọ ridaghi rue ulo-ya.

14. O rue, n'ututu, na Devid degara Joab akwukwọ, we ziga ya site n'aka Uraia.

2. Samuel 11