2. Samuel 11:3-7 Bible Nso (IGBOB)

3. Devid we zìe jua ajuju bayere nwayi ahu. Otù onye we si, Nwayi a, ọ̀ bughi Bat-sheba, nwa-nwayi Eliam, bú nwunye Urai onye Het?

4. Devid we ziga ndi-ozi, kuru ya; nwayi ahu we biakute ya, ya na ya we dina; (ma nwayi ahu si n'ọrurú-ya nēdo onwe-ya nsọ,) o we laghachi n'ulo-ya.

5. Nwayi ahu we turu ime; o zìe, gosi Devid, si, Mu onwem di ime.

6. Devid we zigara Joab ozi, si, Ziterem Uraia onye Het. Joab we zigara Devid Uraia.

7. Uraia we biakute ya, Devid we jua ya ajuju bayere udo Joab, baye-kwa-ra udo ndi Israel, na otú agha nāga.

2. Samuel 11