2. Ndi Tesalọnaika 3:11-15 Bible Nso (IGBOB)

11. N'ihi na ayi nuru okwu bayere ufọdu ndi nādighi-alu ọlu ọ bula, kama ha nētiye aka n'ọlu nke nābughi nke aka ha.

12. Ma ndi di otú a ka ayi nēnye iwu nāriọ kwa aririọ nime Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ka ha were nwayọ nālu ọlu, ri kwa nri nke aka ha.

13. Ma unu onwe-unu, umu-nna-ayi, ike agwula unu n'obi n'ime ihe ọma.

14. Ma ọ buru na onye ọ bula aṅaghi nti okwu ayi ji akwukwọ-ozi a kwu, ribanu onye ahu ama, ka unu ghara iso ya mekọ ihe, ka ewe me ya ihe-ihere n'iru.

15. Unu agukwala ya n'onye-iro, kama nādunu ya ọdú dika nwa-nna.

2. Ndi Tesalọnaika 3